Home / PLACES / Ndị gburu Fada Offu na Ugwu nọzị anyị n’aka – Ndị uweojii Enugu

Ndị gburu Fada Offu na Ugwu nọzị anyị n’aka – Ndị uweojii Enugu

Ndị uweojii na steeti Enugwu ekwuola na ha anwụchiela mmadụ abụọ a na-enyo enyo na aka ha dị n’ogbugbu e gburu otu ụkọchukwu Katọlik n’Enugwu bụ Rev. Fada Clement Rapụlụchukwu Ugwu na nso a.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ebere Amaraizu n’ozi o zipụrụ ọhanaeze nyere aha ndị a dịka, Sunday Chibuko, bụ onye si Ụmụnna Ndịagụ nke dị n’Okpuru Ọchịchị Ezeagụ,ma bụrụkwa onye gbara afọ 32, nakwa Benjamin Osogwu onye gbara afọ 28, onye Obollo Eke nke dị n’Okpuru Ọchịchị Udenu nke steeti ahụ.

Ọ kọwara na anwụchiri ndị agamevu a na-abalị 28 nke ọnwa Maachị, 2019, na-ebe nzuzo ha dị n’ogbe Area 1 Garki, Abuja, site n’usoro nchọpụta tara ọchịchị nke ndị uweojii.

Source BBC Igbo

Ndi Gburu Fada Offu Na Ugwu Nozi

Check Also

Police apprehends the killers of Rev Father Paul Offu

source: AIF Media The Enugu state Police command has arrested two northerners who allegedly murdered …

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

This site uses Akismet to reduce spam. Learn how your comment data is processed.